I. IHE EMERE 21 - Bible Lgbo

1Setan we guzo imegide Israel, o we kpalie Devid iguta Israel.

2Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m'we mara ya.

3Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n'ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n'ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?

4Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ. Joab we pua, jegharia n'Israel nile, biarue Jerusalem.

5Joab we nye Devid ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel. Israel nile we di orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ iri-na-asa na nnù iri, ndi nāmiputa mma-agha: Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ abua na uzọ iri-na-asatọ na nnù iri-na-ise, ndi nāmiputa mma-agha.

6Ma ọ gukọtaghi Livai na Benjamin n'etiti ha: n'ihi na okwu eze bu ihe-árú n'anya Joab.

7Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.

8Devid we si Chineke, Emehiewom nke-uku n'ihe a m'meworo: ma ub͕u a, biko, me ka ajọ omume orù-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.

9Jehova we gwa Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke Devid, okwu, si,

10Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēche n'iru gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.

11Gad we biakute Devid, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nara n'onwe-gi otù n'ihe ndia;

12ma ọ bu oké unwu arọ atọ; ma-ọbu ka ekpochapu gi ọnwa atọ n'iru ndi nākpab͕u gi, ọbuná mma-agha ndi-iro-gi nēru gi aru; ma-ọbu mma-agha Jehova ubọchi atọ, bú ajọ ọria nēfe efe n'ala, mọ-ozi nke Jehova nēbibi kwa n'ókè-ala nile nke Israel. Ma ub͕u a le okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.

13Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m'dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.

14Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we dapu n'Israel.

15Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.

16Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.

17Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti.

18Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.

19Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova.

20Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat.

21Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala.

22Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ.

23Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo.

24Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula.

25Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n'ọtùtù iji zuru ebe ahu.

26Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.

27Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n'ọbọ-ya.

28Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n'ebe ahu.

29Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n'ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n'ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu.

30Ma Devid apughi ije n'iru ya iju Chineke ase: n'ihi na ọ turu egwu nke-uku n'ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help