I. NDI-EZE 3 - Bible Lgbo

1Solomon we ghọ ọgọ Fero eze Ijipt, kuru nwa-nwayi Fero, me ka ọ bata n'obodo Devid, rue mb͕e o wusiri ulo-ya, na ulo Jehova, na mb͕idi Jerusalem buruburu.

2Nání na ndi Israel nāchu àjà n'ebe nile di elu, n'ihi na ọ dighi ulo ewuru aha Jehova rue mb͕e ahu.

3Ma Solomon huru Jehova n'anya, nēje ije n'ukpuru nile nke Devid, bú nna-ya: ọ bu nání na ya onwe-ya nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu.

4Eze we jerue Gibeon ichu àjà n'ebe ahu; n'ihi na nke ahu bu oké ebe di elu: nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri ka Solomon surere n'elu ebe-ichu-àjà ahu.

5Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.

6Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta.

7Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata.

8Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha.

9Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?

10Okwu-ya we di nma n'anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a.

11Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé;

12le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.

13Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.

14Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.

15Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.

16Mb͕e ahu ndinyom abua, bú ndi nākwa iko, biakutere eze, guzo n'iru ya.

17Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n'otù ulo; m'we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n'ulo.

18O rue, n'ubọchi nke-atọ mb͕e m'musiri nwa, na nwayi a mu-kwa-ra nwa; ayi onwe-ayi nọ kwa n'otù ebe; ọ dighi onye ala ọzọ ayi na ya nọ n'ulo, nání ayi abua nọ n'ulo.

19Nwa nwayi a we nwua n'abali; n'ihi na o dinakwasiri ya.

20O we bilie n'etiti abali, kupu nwam n'akukum, ma orù-gi nwayi nāraru ura, o we dọba ya n'obi-ya, ma nwa-ya nke nwuru anwu ka ọ dọbara n'obim.

21M'we bilie n'ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m'we tule ya n'ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m'muru.

22Nwayi nke-ọzọ we si, É-è; kama nke di ndu bu nwam, nke nwuru anwu bu kwa nwa-gi. Ma nke-mbu nāsi, É-è; kama nke nwuru anwu bu nwa-gi, nke di ndu bu kwa nwam. Ha we kwue otú a n'iru eze.

23Eze we si, Otù nwayi nāsi, Nka nke di ndu bu nwam, ma nwa-gi bu nke nwuru anwu: ma nke-ọzọ nāsi, É-è; kama nwa-gi bu nke nwuru anwu, ma nwam bu nke di ndu.

24Eze we si, Wetaram mma-agha. Ha we weta mma-agha n'iru eze.

25Eze we si, Kpọwanu nwa di ndu abua, nye otù nwayi otù nkera, nye kwa nwayi nke-ọzọ nkera ọzọ.

26Nwayi ahu nke nwere nwa di ndu we si eze, (n'ihi na afọ chighariri ya n'aru nwa-ya,) o we si, Biko, onye-nwem, nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli. Ma nwayi nke-ọzọ nāsi, M'gaghi-enwe ya, i gaghi-enwe kwa ya; kpọwanu ya.

27Eze we za, si, Nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli: nwayi a bu nne-ya.

28Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help