ABÙ ỌMA 93 - Bible Lgbo

1Jehova bu eze; idi-elu ka O yiriworo dika uwe;

Jehova eyiriwo uwe, O werewo ike ke Onwe-ya n'úkwù:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.

2Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mb͕e ochie:

Site na mb͕e ebighi-ebi ka I nọ.

3Osimiri eweliwo olu-ha, Jehova,

Osimiri eweliwo olu-ha;

Osimiri nēweli ebili-miri nile ha elu.

4Kari olu nile nke ọtutu miri,

Kari ebili-miri nile di ebube nke oké osimiri,

Jehova Nke nọ n'ebe di elu di ebube.

5Ihe-àmà-Gi nile kwesiri ntukwasi-obi nke-uku:

N'ebe ulo-Gi di idi-nsọ mara nma,

Jehova, rue ubọchi nile nke ndu di ogologo.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help