ABÙ ỌMA 148 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Tonu Jehova site n'elu-igwe:

Tonu Ya n'ebe di elu.

2Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile:

Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.

3Tonu Ya, anyanwu na ọnwa:

Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.

4Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe,

Na miri nke di n'elu elu-igwe.

5Ka ha to aha Jehova:

N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.

6O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi:

Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.

7Tonu Jehova site n'uwa,

Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:

8Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu:

Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9Ugwu nile na ugwu ntà nile;

Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10Anu-ọhia na anu-ulo nile;

Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

11Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche;

Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:

12Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ;

Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:

13Ka ha too aha Jehova;

N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya:

Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.

14O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu,

Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto;

Bú umu Israel, ndi di nso Ya.

Tonu Ja.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help