DEUTERONOMI 24 - Bible Lgbo

1Mb͕e nwoke gāluru nwunye, we buru di-ya, ọ gēru kwa, ọ buru na nwayi ahu ahutaghi amara n'iru ya, n'ihi na ọ huwo ihe nēkwesighi ekwesi n'aru ya, na ọ gēdere ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya.

2Ma mb͕e o si n'ulo-ya pua, ọ gēje kwa buru nwunye nke nwoke ọzọ.

3Ma asi na nwoke nke-ikpe-azu ahu akpọ ya asì, de-kwa-ra ya akwukwọ nkewa, we nye ya n'aka, we zipu ya n'ulo-ya; ma-ọbu mb͕e nwoke nke-ikpe-azu ahu gānwu, bú nke lutara ya n'onwe-ya na nwunye;

4di mbu ya, nke zipuru ya, apughi ikpoghachi ya ọzọ iburu ya nwunye, mb͕e emerusiri ya; n'ihi na ihe-árú ka ọ bu n'iru Jehova: emela ka ala ahu mehie, bú nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibu ihe-nketa.

5Mb͕e nwoke gāluru nwunye ọhu, ọ gaghi-apu ba n'usu-ndi-agha, madu agaghi-agabiga rue ebe ọ nọ bayere ihe ọ bula: onye puru n'òfùfè-ala ka ọ gābu n'ulo-ya otù arọ, ọ gēme kwa ka nwunye-ya nke ọ luruworo ṅuria ọṅu.

6Madu agaghi-ewere nkume-igwe-nri ma-ọbu aka-nkume n'ihe-ibe: n'ihi na ndu madu ka onye ahu nēwere n'ihe-ibe.

7Mb͕e agāhu onye ọ bula ka o nēzu madu n'ori sitere n'umu-nne-ya, sitere n'umu Israel, o we nēme ya dika orù, ma-ọbu re ya; onye-ori ahu gānwu kwa: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.

8Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.

9Cheta ihe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Miriam, n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta.

10Mb͕e i nēbinye madu-ibe-gi ihe-nbinye ọ bula, abala n'ulo-ya iwere ihe-ibe-ya.

11N'èzí ka i gēguzo, nwoke ahu onye gi onwe-gi nēbinye ihe gēweputa-kwa-ra gi ihe-ibe-ya n'èzí.

12Ma ọ buru na onye ewedara n'ala ka ọ bu, ewela ihe-ibe-ya dina ala:

13i ghaghi inyeghachi ya ihe-ibe ahu mb͕e anyanwu nāda, ka o we dina ala n'uwe-ya, we gọzie gi: o we buru gi ezi omume n'iru Jehova, bú Chineke-gi.

14Emeb͕ula onye egoro ọlu nke bu onye ewedera n'ala na ob͕eye, ma o sitere n'umu-nne-gi, ma-ọbu na o sitere na ndi-ọbìa-gi ndi nọ n'ala-gi nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula.

15N'ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n'ihi na onye ewedara n'ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.

16Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka ya.

17Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe:

18ma i gēcheta na orù ka i buri n'Ijipt, Jehova, bú Chineke-gi, we b͕aputa gi n'ebe ahu: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a.

19Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile.

20Mb͕e i nētisisi nkpuru osisi olive gi, eletala alaka-ya ọzọ n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

21Mb͕e i nāghọrọ nkpuru ubi-vine-gi, atutukọla nkpuru-ya fọduru n'azu gi: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri.

22I gēcheta kwa na orù ka i buri n'ala Ijipt: n'ihi nka ka m'nēnye gi iwu ime ihe a.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help