II. SAMUEL 2 - Bible Lgbo

1O rue, ka nka gasiri, na Devid juru Jehova ese, si, M'gārigo n'otù nime obodo Juda? Jehova we si ya, Rigo. Devid we si, Òle ebe M'gārigo? Ọ si, Rue Hebron.

2Devid we rigo n'ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel.

3Ndikom ndi ya na ha nọ ka Devid me-kwa-ra ka ha rigota, nwoke ọ bula na ulo-ya: ha we biri n'obodo nile nke Hebron.

4Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda.

Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl.

5Devid we zigara ndikom Jebesh-gilead ndi-ozi, si, ha, Ndi agọziri agọzi diri Jehova ka unu bu, na unu emeworo onye-nwe-unu, bú Sọl, ebere a, unu we líe-ya.

6Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a.

7Ma ub͕u a ka aka-unu di ike, buru-kwa-nu ndi-dinkpà: n'ihi na onye-nwe-unu, bú Sọl, anwuwo; ọzọ kwa, mu ka ulo Juda teworo manu ibu eze-ha.

8Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim;

9o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile.

10(Ish-boshet nwa Sọl b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ malitere ibu eze Israel, o we buru eze arọ abua.) Otù ọ di, ulo Juda soro Devid.

11Ọnu-ọgugu ubọchi Devid bu eze ulo Juda nime Hebron we di arọ asa na ọnwa isi.

12Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon.

13Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n'otù n'akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n'otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n'akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri.

14Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n'iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie.

15Ha we bilie gabiga n'ọnu-ọgugu; madu iri na abua diri Benjamin, di-kwa-ra Ish-boshet nwa Sọl, na madu iri na abua nime ndi-orù Devid.

16Ha we jide, nwoke ọ bula o jide isi ibe-ya, we ma mma-agha-ya n'akuku ibe-ya; ha we dakọ n'otù: ewe kpọ aha ebe ahu Helkat-hazurim, nke di na Gibeon.

17Agha we di ike nke-uku n'ubọchi ahu, ewe tib͕ue Abnea na ndikom Israel n'iru ndi-orù Devid.

18Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia.

19Asahel we chua Abnea n'azu; ma o sighi n'iso Abnea wezuga onwe-ya ije n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

20Abnea we gha anya n'azu, si, Ọ̀ bu gi bu nka, Asahel? Ọ si, Mu ka ọ bu.

21Abnea we si ya, Wezuga onwe-gi n'aka-nri-gi ma-ọbu n'aka-ekpe-gi, jidere onwe-gi otù nime umu-okorọbia, chiri n'onwe-gi ihe-ya i gāluta. Ma Asahel ekweghi isi n'iso ya wezuga onwe-ya.

22Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n'isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m'gētib͕u gi rue ala? m'gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum?

23Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro.

24Ma Joab na Abishai churu Abnea n'azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n'iru Gia n'uzọ ọzara Gibeon.

25Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà.

26Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi?

27Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya.

28Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ.

29Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n'Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim.

30Joab we si n'iso Abnea lata: ọ we chikọta ndi-ya nile, ma agukọtara ndikom iri na iteghete na Asahel ndi nādighi n'etiti ndi-orù Devid.

31Ma ndi-orú Devid tib͕uru ọgu ndikom iri-na-asatọ sitere na Benjamin, na n'etiti ndikom Abnea, ha we nwua.

32Ha we bulie Asahel, lìe ya n'ílì nna-ya, nke di na Bet-lehem. Joab na ndikom-ya we je ije abali ahu nile, ìhè ututu we putara ha na Hebron.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help