ABÙ ỌMA 80 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim Eduth. Abù Ọma nke Esaf.

1Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti,

Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu;

Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.

2N'iru Efraim na Benjamin na Manase, kpọte idi-ike-Gi,

Je izọputa ayi.

3Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

4Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,

Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?

5I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri,

I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.

6I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù:

Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha.

7Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;

Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

8I si n'Ijipt ropu osisi vine:

I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.

9I doziri ọnọdu n'iru ya,

O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.

10Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,

Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.

11Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,

Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.

12N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,

Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?

13Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya,

Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.

14Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:

Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,

15Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo,

Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume.

16Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya:

Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì.

17Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi,

N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.

18Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu:

Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.

19Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;

Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help