1Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu.
2Unu gēme àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; otù nwa-oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ nke zuru okè:
3na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ahu,
4na otù uzọ n'uzọ iri iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:
5na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu:
6nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.
7Ọzọ, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje.
8ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova, bú ihe ísì utọ; otù nwa-oke-ehi, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otú arọ; nke zuru okè ha gāburu unu:
9na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu,
10otù uzọ n'uzọ iri, otú uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu:
11otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nmehie nkpuchi-nmehie, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.
12Ọzọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje, unu gēme-kwa-ra Jehova ememe ubọchi asa:
13unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova; umu-oke-ehi iri na atọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ; nke zuru okè ka ha gābu:
14na onyinye-inata-iru-ọma-ha, utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ọ bula nime oke-ehi iri na atọ ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ọ bula nime ebulu abua ahu,
15otù uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu iri na anọ ahu:
16na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
17N'ubọchi nke-abua unu gēweta kwa nso umu-oke-ehi iri na abua, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:
18na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
19na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.
20N'ubọchi nke-atọ kwa oke-ehi iri-na-otù, ebulu, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè;
21na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na otù ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
22na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inatu-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
23N'ubọchi nke-anọ kwa oke-ehi iri, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:
24na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iri ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
25na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
26N'ubọchi nke-ise kwa oke-ehi iteghete, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otú arọ, nke zuru okè;
27na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iteghete ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
28na otú nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
29N'ubọchi nke-isi kwa oke-ehi asatọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ zuru okè:
30na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asatọ ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
31na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya nile.
32N'ubọchi nke-asa kwa oke-ehi asa, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:
33na onyinye-inata-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asa ahu, na iji ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
34na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
35N'ubọchi nke-asatọ nb͕ochi gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:
36ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku. bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:' otú oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè:
37onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-oṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi ahu, na iji chu ebulu ahu, na iji chu umu-aturu ahu, gādi n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di:
38na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
39Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu.
40Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.