ABÙ ỌMA 109 - Bible Lgbo

Abú Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti;

2N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem:

Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu.

3Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu,

We busom agha n'efu.

4N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem:

Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere.

5Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,

Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam.

6Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya:

Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya.

7Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara;

Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie.

8Ka ubọchi-ya di ole-na-ole;

Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya.

9Ka umu-ya buru umu-nb͕ei,

Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru.

10Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ;

Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya.

11Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà;

Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha.

12Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere;

Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara.

13Ka eriri-umu-ya diri nbipu;

N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.

14Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà;

Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.

15Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile,

Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.

16N'ihi na o chetaghi ime ebere,

O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye,

Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua.

17Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya;

Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ.

18O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya,

O we ba nime ya dika miri,

Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu.

19Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya,

Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile.

20Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia,

Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim.

21Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi:

N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam.

22N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu,

Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.

23Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo:

Arurupuwom dika igurube.

24Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu;

Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.

25Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta:

Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha.

26Yerem aka, Jehova, Chinekem;

Zọputam dika ebere-Gi si di:

27Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu;

Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya.

28Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi:

Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.

29Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe,

Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda.

30M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku;

E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya.

31N'ihi na O gēguzo n'aka-nri nke ob͕eye,

Izọputa ya n'aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help