AISAIA 35 - Bible Lgbo

1Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādighi gēteghari kwa egwú ọṅù, b͕awa okoko-ọhia, dika rose.

2Ọ gāb͕awa nke-uku, teghari kwa egwú ọṅù, e, n'iteghari-egwú-ọṅù na n'iti-nkpu-ọṅù; nsọpuru Lebanon ka agēnye ya, e, ima-nma nke Kamel na Sheron: ndia gāhu ebube Jehova, bú ima-nma nke Chineke-ayi.

3Menu aka kudara akuda ka ha di ike, b͕a-kwa-nu ikperè nāsu ngọngọ ume.

4Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu.

5Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe.

6Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n'ihi na n'ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n'ala ihe nādighi.

7Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n'ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus.

8Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.

9Ọ dighi ọdum gādi n'ebe ahu, ọ dighi kwa anu-ọhia nke di irè gārigo n'elu ya, agaghi-ahu ya n'ebe ahu; ma ndi emeworo ka ha nwe onwe-ha nēje ije n'ebe ahu:

10ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help