II. IHE EMERE 15 - Bible Lgbo

1Mọ nke Chineke we dakwasi Azaraia nwa Oded:

2o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.

3Ma ọtutu ubọchi ka Israel nọ nēnweghi Chineke nke ezi-okwu, nēnweghi kwa onye-nchu-àjà nēzí ihe, nēnweghi kwa iwu:

4ha we chigharikute Jehova, bú Chineke Israel, nime nkpab͕u diri ha, we chọ Ya, O we me ka ha chọta Ya.

5Ma na mb͕e ahu ọ dighi udo diri onye nāpu apu, ma-ọbu diri onye nābata abata, kama ọtutu ib͕a-aghara dikwasiri ndi nile bi n'ala ahu nile.

6Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha.

7Ma unu onwe-unu, dinu ike, ekwela ka aka-unu kuda: n'ihi na ugwọ-ọlu diri ọlu-unu.

8Ma mb͕e Esa nuru okwu ndia, na obubu-amuma nke Oded, bú onye-amuma, o mere onwe-ya ka ọ di ike, we me ka ihe-árú nile si n'ala Juda na Benjamin nile, si kwa n'obodo nile nke ọ naputara n'ugwu Efraim, gabiga; o me kwa ka ebe-ichu-àjà Jehova di ọhu, bú nke di n'iru uzọ-nbata Jehova.

9Ọ chikọta Juda na Benjamin nile, na ndi nānọ dika ọbìa n'etiti ha site n'Efraim na Manase, site kwa na Simeon: n'ihi na ha siri n'Israel dayere ya n'uba, mb͕e ha huru na Jehova, bú Chineke-ya, nọyere ya.

10Ha we chikọta onwe-ha nime Jerusalem n'ọnwa nke-atọ, n'arọ nke-iri-na-ise nke Esa bu eze.

11Ha we chuara Jehova àjà n'ubọchi ahu, site n'ihe-nkwata ha bubatara, bú nnù ehi na ọgu iri-na-ise, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri.

12Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha;

13na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel.

14Ha we were oké olu, were kwa iti-nkpu, were kwa opì, were kwa opì-ike, ṅuara Jehova iyi.

15Juda nile we ṅuria ọṅu n'ọṅuṅu-iyi ahu: n'ihi na ha were obi-ha nile ṅua iyi, were kwa otú ọ nātọzu ha utọ chọ Ya; O we me ka ha chọta Ya: Jehova we me ka ha zuru ike buruburu.

16Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron.

17Ma esighi n'Israel wezuga ebe di elu: otú ọ di, obi Esa zuru okè n'ubọchi-ya nile.

18Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.

19Agha adighi kwa ọzọ rue arọ nke-orú-na-iri-na-ise nke Esa bu eze.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help