ABÙ ỌMA 149 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Bùkuenu Jehova abù ọhu,

Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya.

2Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya:

Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha.

3Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú:

Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.

4N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ:

Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma.

5Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru:

Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha.

6Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha,

Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha;

7Ibọ̀ ọ́bọ̀ n'aru mba nile,

Ibara ndi nile di iche iche nba;

8Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha,

Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru;

9Ime n'aru ha ikpé edere n'akwukwọ:

Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere.

Tonu Ja.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help