I. IHE EMERE 4 - Bible Lgbo

1Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal.

2Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra.

3Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi:

4na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem.

5Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara.

6Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara.

7Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan.

8Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum.

9Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u.

10Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.

11Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton.

12Eshton we mua Bet-rafa, na Pasea, na Tehina, bú nna Ia-nehash. Ndia bu ndikom Rika.

13Umu-ndikom Kenaz kwa; Ọtniel, na Seraia: umu-ndikom Ọtniel kwa; Hatat.

14Meonotai we mua Ọfra: Seraia mu-kwa-ra Joab, bú nna Gi-harashim: n'ihi na ndi-ọ̀kà ka ha bu.

15Umu-ndikom Keleb nwa Jefune kwa; Iru, na Ila, na Naam: umu-ndikom Ila kwa; na Kenaz.

16Umu-ndikom Jehalelel kwa; Zif, na Zifa, na Tiria, na Asarel.

17Umu-ndikom Ezra kwa; Jeta, na Mered, na Ifa, na Jalon: o we mua Miriam, na Shamai, na Ishba, bú nna Eshtemoa.

18Nwunye-ya, bú Hajehudija, we mua Jered nna Gedoa, na Heba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa. Ndia bu kwa umu-ndikom Bitia, bú nwa-nwayi Fero, nke Mered luru na nwunye.

19Umu-ndikom nwunye Hodia, nwa-nne-nwayi Naham, bu nna Keila onye-Gamait, na Eshtemoa onye Meakat.

20Umu-ndikom Shimon kwa; Amnon, na Rina, na Ben-hanan, na Tilon. Umu-ndikom Ishi kwa; Zohet, na Ben-zohet.

21Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia;

22na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie.

23Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n'aka eze n'ije-ozi-ya ka ha biri n'ebe ahu.

24Umu-ndikom Simeon; Nemuel, na Jamin, na Jarib, na Zera, na Shaul:

25Shalum nwa-ya, Mibsam nwa-ya, Mishma nwa-ya.

26Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya.

27Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda.

28Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual;

29na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad;

30na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag;

31na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze.

32Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise:

33na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha.

34Na Meshobab, na Jamlek, na Josha nwa Amazaia;

35na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel;

36na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia;

37na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia;

38Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu.

39Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha.

40Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n'akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n'ihi na ndi bi n'ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham.

41Ndia ndi edeworo n'akwukwọ n'aha we bia n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n'ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n'ọnọdu ha: n'ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n'ebe ahu.

42Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha.

43Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help