JENESIS 28 - Bible Lgbo

1Aisak we kpọ Jekob, gọzie ya, nye ya iwu, si ya, Gi alula nwunye sitete n'umu-ndinyom Keneam.

2Bilie, je Padan-eram, rue ulo Betuel, bú nna nne-gi; si n'ebe ahu lutara onwe-gi nwunye sitere n'umu-ndinyom Leban, bú nwa-nne-nwoke nne-gi.

3Ka Chineke Nke puru ime ihe nile gọzie gi, me ka i mua, ọmùmù, Ya me kwa ka i ba uba, ka i we ghọ nkpọkọta nke ndi di iche iche:

4Ya nye kwa gi ngọzi Abraham, gi, na nkpuru-gi tiyere gi; ka i we nweta ala nke ọnọdu-ọbìa-gi nile, nke Chineke nyere Abraham.

5Aisak we zipu Jekob: ọ je Padan-eram, jekuru Leban, nwa Betuel onye Siria, bú nwa-nne-nwoke Rebeka, nne Jekob na Isọ.

6Isọ we hu na Aisak gọziri Jekob, zipu kwa ya ije Padan-eram, isi n'ebe ahu lutara onwe-ya nwunye; ọ hu kwa na, mb͕e ọ nāgọzi ya, na ọ nyere ya iwu, si, Gi alula nwunye sitere n'umu-ndinyom Kenean;

7ọ hu kwa na Jekob gere nna-ya, ge kwa nne-ya, nti, we je Padan-eram:

8Isọ we hu na umu-ndinyom Kenean jọrọ njọ n'anya Aisak nna-ya;

9Isọ we jekuru Ishmael lutara onwe-ya Mahalat na nwunye, bú nwa-nwayi Ishmael nwa Abraham, bú nwa-nne-nwayi Nebaiot, tiyere ndinyom ọ nwere.

10Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran.

11Ọ biarue n'otù ebe, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu, n'ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n'okpuru isi-ya, we dina n'ebe ahu

12Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya.

13Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;

14nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.

15Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya.

16Jekob we teta n'ura-ya, si, N'ezie Jehova nọ n'ebe a; ma mu onwem amaghi ya.

17Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe.

18Jekob we bilie n'isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n'okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n'elu ya.

19Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.

20Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie,

21m'we lata n'ulo nnam n'udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke,

22nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help