1Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu,
Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile.
2N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri:
Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma.
3Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi:
Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi.
4Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahu
Nke nātu egwu Jehova.
5Jehova gēsi na Zaion gọzie gi:
Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi,
6Hu kwa umu nke umu-gi gāmu.
Ka udo dikwasi Israel.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.