AISAIA 51 - Bible Lgbo

1Genum nti, unu ndi nāb͕aso ezi omume, ndi nāchọ Jehova: legidenu oké nkume anya nke esiri waputa unu, legide-kwa-nu ọnu olùlù nke esiri gwuputa unu.

2Legidenu Abraham, bú nna-unu, legide kwa Sera nke muputara unu: n'ihi na -o bu mb͕e ọ bu nání otù onye ka M'kpọrọ ya, M'we gọzie ya, me ka ọ ba uba.

3N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.

4Ṅanum nti, unu ndim; unu kwa mba nkem, gēnum nti: n'ihi na otù iwu gēsi n'ọnum puta, M'gēme kwa ka ikpém nwe ọnọdu ka ọ buru ìhè nke ndi nile.

5Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere.

6Welienu anya-unu le elu-igwe, legide-kwa-nu uwa di n'okpuru: n'ihi na elu-igwe gāpu n'anya dika anwuru-ọku, uwa gāka kwa nká dika uwe, ndi bi ya gānwu kwa dika anwu ntà: ma nzọputam gādiru mb͕e ebighi-ebi, agaghi-ebibi kwa ezi omumem.

7Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha.

8N'ihi na nla gērichapu ha dika uwe, aruru gērichapu kwa ha dika aji-anu: ma ezi omumem gādiru mb͕e ebighi-ebi, nzọputam gādiru kwa ọb͕ọ nile.

9Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?

10Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga?

11Ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ab͕alawo.

12Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;

13i we chezọ Jehova Onye meworo gi, Onye nēseti elu-igwe, tọ kwa ntọ-ala uwa: i we tua oké egwu mb͕e nile ogologo ubọchi nile n'ihi ọnuma nke onye-nkpab͕u, mb͕e o doziri àkú ibibi? ma òle ebe ọnuma nke onye-nkpab͕u ahu di?

14Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.

15Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

16M'we tiye okwum nile n'ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M'kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu.

17Teta, teta, bilie Jerusalem, nke siworo n'aka Jehova ṅua iko nke ọnuma-Ya; ọkwa ahu, bú iko nke isu-ngọngọ, ka i ṅuworo, ṅusia.

18Ọ dighi onye-ndú o nwere n'etiti umu-ndikom nile ọ muworo: ọ dighi kwa onye nējide aka-ya n'etiti umu-ndikom nile o meworo ka ha tozue okè.

19Ihe abua ndia adakwasiwo gi; ebere o nwere n'aru gi? nbibi na ntikpọ na oké unwu na mma-agha: M'gēsi aṅa kasie gi obi?

20Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi.

21N'ihi nka, biko, nuru nka, gi nwanyi ewedara n'ala, nke ihe nēb͕u kwa, ma ọ bughi manya-vine:

22otu a ka Onye-nwe-gi siri, bú Jehova, na Chineke-gi Nke nēkpe ọnu ndi-Ya n'ikpe, Le, ewepuwom n'aka-gi iko nke isu-ngọngọ, bú ọkwa ahu nke bu iko nke ọnumam; i gaghi-aṅu kwa ya ọzọ:

23ma M'gētiye ya n'aka ndi nēmekpa gi aru; ndi siri nkpuru-obi-gi, Ruda n'ala, ka ayi we gabiga: i we me ka azu-gi di ka ala na dika èzí nye ndi nāgabiga.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help