ỌPUPU 31 - Bible Lgbo

1Jehova we gwa Moses okwu, si,

2Le, akpọwom Bezalel n'aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda:

3emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula,

4icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla,

5na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà na idukọta ya adukọta, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula.

6Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n'obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M'tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M'nyeworo gi n'iwu:

7ulo-ikwū nzute, na ib͕e nke diri ihe-àmà ahu, na ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ya, na ihe nile nke Ulo-ikwū ahu;

8na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,

9na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya:

10na uwe nile akpara nke ọma, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-aja, nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà;

11na manu nke otite-manu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, bú nke diri ebe nsọ ahu: dika ihe M'nyeworo gi n'iwu si di, otú a ka ha gēme.

12Jehova we gwa Moses okwu, si,

13Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N'ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n'ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ.

14Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n'ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n'ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n'etiti umu-nna-ya.

15Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua.

16Ma umu Israel gēdebe ubọchi-izu-ike, ime ememe ubọchi-izu-ike ahu rue ọb͕ọ-ha nile, ọ bu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

17Ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, ma ọ bu n'ubọchi nke-asa ka Ọ kwusiri n'ọlu-Ya, wee zuru ike.

18Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help