ỌNU-ỌGUGU 27 - Bible Lgbo

1Ha we biarue nso, bú umu-ndinyom Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, nke ab͕uru Manase nwa Josef: ndia bu aha umu-ya ndinyom; Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.

2Ha we guzo n'iru Moses, na n'iru Eleeza, bú onye-nchu-aja, na n'iru ndi-isi na nzukọ Israel nile, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, si,

3Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere.

4N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom.

5Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova.

6Jehova we gwa Moses okwu, si,

7Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka.

8Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka.

9Ma ọ buru na o nweghi nwa-nwayi, unu gēnye kwa umunne-ya ndikom ihe-nketa-ya.

10Ma ọ buru na ọ nweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa umu-nne nna-ya ndikom ihe-nketa-ya.

11Ma ọ buru na nna-ya enweghi umu-nne-ndikom, unu gēnye kwa onye-aru-ya nke di ya nso site n'ab͕uru-ya ihe-nketa-ya, ọ gēnweta kwa ya: ọ gābu-kwa-ra umu Israel ukpuru ikpé, dika Jehova nyere Moses iwu.

12Jehova we si Moses, Rigo n'ugwu Abarim nka, hu kwa ala ahu nke M'nyeworo umu Israel.

13Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:

14n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin.)

15Moses we gwa Jehova okwu, si,

16Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,

17onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.

18Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi;

19guzo kwa ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọm nile; nye ya iwu n'anya-ha.

20I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu.

21Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.

22Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọ Israel nile:

23o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n'aka Moses.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help