JOB 32 - Bible Lgbo

1Ndikom atọ ndia we kwusi iza Job, n'ihi na ya onwe-ya bu onye ezi omume n'anya-ya.

2Iwe Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, site n'ab͕uru Ram, we di ọku: megide Job ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ọ guru onwe-ya n'onye ezi omume kari Chineke.

3Ọzọ, megide ndi-eyì-ya atọ ka iwe-ya di ọku, n'ihi na ha achọtaghi ihe-ọziza ha gēji ma Job ikpe.

4Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha.

5Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.

6Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si,

Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká;

N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.

7Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu,

Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.

8N'ezie mọ di nime madu,

Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.

9Ọ bughi ndi uku mara ihe,

Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.

10N'ihi nka ka m'siri, Gem nti;

M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.

11Le, echerem okwu-unu,

Anamaṅa nti nghọta-unu,

Rue mb͕e unu gēgwuputa ala okwu nile.

12E, anamelekwasi unu anya,

Ma, le, ọ dighi onye nēso Job ru uka,

Ma-ọbu nke nāza okwu-ọnu-ya nile, n'etiti unu.

13Lezienu anya ka unu ghara isi, Ayi achọtawo amam-ihe;

Chineke gāchipu ya, ọ bughi madu:

14N'ihi na o doghi okwu-ya n'usoro imegidem;

M'gaghi-eji kwa okwu-ọnu-unu zaghachi ya.

15Ha atuwo ujọ, ha azaghi kwa ọzọ:

Ha ewepuwo okwu nile n'ọnu onwe-ha.

16M'gēcheta kwa, n'ihi na ha adighi-ekwu,

N'ihi na ha eguzowo, ghara iza ọzọ?

17M'gāza òkèm, ọbuná mu onwem,

M'gēkwuputa ihe m'mara, ọbuná mu onwem.

18N'ihi na ejuputaram n'okwu;

Mọ nke di n'afọm akpab͕uwom.

19Le, afọm di ka manya-vine nke anākwupughi akwupu;

Dika karama-akpukpọ ọhu, ọ nāb͕awa ab͕awa.

20Ka m'kwue, ka aru we dajuam;

M'gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum, za.

21Biko, ka m'ghara ihu nwoke ọ bula iru-ọma;

M'gaghi-etu kwa madu aha.

22N'ihi na amaghm itu aha;

Ọ buru otú a Onye kèrem gēbupum na nwa mb͕e ntà.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help