ABÙ ỌMA 36 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke orù Jehova, bú Devid.

1Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obim

Ọ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua.

2N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya,

Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì.

3Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ:

Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.

4Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya;

Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma;

Ọ dighi-aju ihe ọjọ.

5Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di;

Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé.

6Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke;

Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne:

Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova.

7Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke!

Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua.

8Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi;

Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.

9N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di:

N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.

10Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi;

Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi.

11Ekwela ka ukwu npako biakwasim,

Ekwe-kwa-la ka aka nke ndi nēmebi iwu me ka m'wagharia.

12N'ebe ahu ka ndi nālu ajọ ihe daworo:

Enudawo ha, ha apughi kwa ibili ọzọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help