1Ndi-isi nke ndi bu nna nke ab͕uru umu Gilead, nwa Makia, nwa Manase, n'etiti ab͕uru umu Josef, we biarue nso, kwue okwu n'iru Moses, na n'iru ndi-isi, bú ndi-isi nke ndi bu nna nke umu Israel:
2ha we si, Jehova nyere onye-nwem iwu inye umu Israel ala ahu n'ihe-nketa n'ife-nzà: enye-kwa-ra onye-nwem iwu n'ọnu Jehova iwere ihe-nketa Zelọfehad, bú nwa-nne-ayi, nye umu-ya ndinyom.
3Ma asi na ha gāghọrọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu ebo ọzọ nke umu Israel nwunye, agāgupu kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke nna-ayi-hà, tukwasi ya n'ihe-nketa ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ya n'ihe ife-nzà nke ihe-nketa-ayi.
4Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n'ihe-nketa ebo nna-ayi-hà.
5Moses we nye umu Israel iwu n'okwu-ọnu Jehova, si, Ihe ziri ezi ka ebo umu Josef nēkwu.
6Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu bayere umu-ndinyom Zelọfehad, si, Nwoke di nma n'anya-ha ka ha gāburu nwunye; nání ọ bu ab͕uru nke ebo nke ndi bu nna-ha ka ha gāburu nwunye.
7Ọ dighi kwa ihe-nketa umu Israel nwere gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu: n'ihi na umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa ebo nna-ya-hà.
8Nwa-nwayi nwoke ọ bula, nke nēnweta ihe-nketa n'ebo nile nke umu Israel, gāburu otù nwoke sitere n'ab͕uru nke ebo nna-ya nwunye, ka umu Israel we nweta, nwoke ọ bula ihe-nketa nna-ya-hà.
9Ọ dighi kwa ihe-nketa gēsi n'ebo fe n'ebo ọzọ buruburu; n'ihi na ebo nile nke umu Israel gārapara, nwoke ọ bula n'ihe-nketa nke aka ya.
10Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu-ndinyom Zelọfehad mere:
11Mahla, na Tiaza, na Họgla, na Milka, na Noa, bú umu-ndinyom Zelọfehad, we buru nwunye umu umu-nne nna-ha.
12Ọ bu ndikom nke sitere n'ab͕uru umu Manase nwa Josef ka ha buru nwunye, ihe-nketa-ha we digide n'ebo nke ab͕uru nna-ha.
13Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.