NDI ROM 14 - Bible Lgbo

1Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi.

2Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.

3Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya.

4Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n'ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n'ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo.

5Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya.

6Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke.

7N'ihi na ọ dighi onye ọ bula n'etiti ayi nke di ndu n'ebe ya onwe-ya nọ, ọ dighi kwa onye ọ bula nwuru anwu n'ebe ya onwe-ya nọ.

8N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi.

9N'ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu.

10Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke.

11N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,

Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru,

Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke.

12Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.

13Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.

14Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.

15N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.

16Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu:

17n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.

18N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu.

19Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.

20Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya.

21Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya.

22Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa.

23Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help