ABÙ ỌMA 86 - Bible Lgbo

Ekpere Devid.

1Jehova, tọ nti-Gi n'ala, zam;

N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu.

2Debe nkpuru-obim; n'ihi na onye-ebere ka m'bu:

Gi onwe-gi Chinekem, zọputa orù-Gi nke nātukwasi obi na Gi.

3Merem amara, Onye-nwe-ayi;

N'ihi na Gi ka m'nākpọku ogologo ubọchi nile.

4Me ka nkpuru-obi orù-Gi ṅuria;

N'ihi na ọ bu Gi, Onye-nwe-ayi, ka m'nēbuli nkpuru-obim nye.

5N'ihi na Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, di nma, I bu kwa onye nāb͕aghara nmehie,

I nāba kwa uba n'ebere n'aru ndì nile nākpọku Gi.

6Jehova, ge nti n'ekperem;

Ṅa kwa nti n'olu arirọ-amaram nile.

7N'ubọchi nkpàm m'gākpọku Gi;

N'ihi na I gāzam.

8Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi;

Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.

9Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi;

Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.

10N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche:

Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.

11Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi:

Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi.

12M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke;

M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13N'ihi na ebere-Gi di uku n'arum;

I siwo n'ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim.

14Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem,

Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim,

Ha edoghi kwa Gi n'iru ha.

15Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara,

Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu.

16Chem iru, me-kwa-ram amara

Nye orù-Gi ike-Gi,

Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi.

17Merem ihe-iriba-ama bayere ezi ihe I gēmerem;

Ka ndi nākpọm asì we hu ya, ka ihere we me ha,

N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, eyeworom aka, kasikwam obi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help