AISAIA 31 - Bible Lgbo

1Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!

2Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe.

3Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi.

4N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.

5Dika umu-nnunu nēfe efe, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi Jerusalem; nēb͕ochi nānaputa; nāgabiga nēme ya ka o wepuga onwe-ya.

6Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.

7N'ihi na n'ubọchi ahu ha gāju, onye ọ bula ọ ju ihe-efu ọla-ọcha ya nile na ihe-efu ọla-edo ya nile, nke aka-unu mere nye onwe-unu, ibu nmehie.

8Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.

9Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help