ABÙ ỌMA 27 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke Devid.

1Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu?

Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu?

2Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum,

Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala.

3Ọ buru na ọmuma-ulo-ikwū ndi-agha ama ulo-ikwū-ha imegidem,

Obim agaghi-atu egwu:

Ọ buru na agha ebilie imegidem,

Na nka ka mu onwem nātukwasi obi.

4Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ;

Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum,

Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.

5N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ:

Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya;

N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu.

6Ma ub͕u a agēbuli isim elu n'elu ndi-irom dim buruburu;

M'ga-achukwa àjà nke iti-nkpu n'ulo-ikwū-Ya;

M'gābù abù, m'gābùku kwa Jehova abù ọma.

7Jehova, nuru mb͕e m'were olum kpọ òkù:

Me-kwa-ram amara, zakwam.

8Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum;

Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.

9Ezonarilam iru-Gi;

Ejila iwe wezuga orù-Gi:

Iye-akam ka I buworo;

Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.

10N'ihi na nnam na nnem arapuwom,

Ma Jehova gēkubatam.

11Jehova, zím uzọ-Gi;

Durukwam n'okporo-uzọ di lari,

N'ihi ndi nēchem anwu.

12Enyelam n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi nākpab͕um:

N'ihi na ndi-àmà okwu-ugha ebiliwo imegidem, ha na ndi nēkupu ihe-ike dika ume.

13M'gēme aṅa ma asi na ekweghm na m'gēle idi-nma Jehova

N'ala ndi di ndu?

14Nēle anya Jehova:

Di ike, ka obi-gi nwe kwa ume;

E, nēle anya Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help