ABÙ ỌMA 107 - Bible Lgbo

1Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:

N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a,

Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u;

3O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha,

Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu,

Site n'Ugwu na site n'oké osimiri.

4Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara.

5Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu,

Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.

6Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,

O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.

7O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi,

Ijeru obodo obibi.

8Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

9N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,

Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.

10Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,

Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;

11N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,

Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:

12O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu;

Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.

13Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,

O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.

14O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,

Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.

15Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

16N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,

B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.

17Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'ala

Site n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.

18Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;

Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.

19Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,

O we zọputa ha na nkpà-ha nile.

20O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,

O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.

21Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

22Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,

Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.

23Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,

Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;

24Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,

Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.

25N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,

Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.

26Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:

Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.

27Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè,

Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.

28Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,

Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.

29Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du,

Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.

30Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju;

O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ.

31Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,

Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

32Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya,

Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye.

33O nēme ka osimiri ghọ ọzara,

O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku;

34Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú,

Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme.

35Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri,

Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa.

36O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu,

Ha we dozie obodo obibi;

37Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche,

Nweta nkepuru nke ihe-ọmume.

38Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku;

Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata.

39Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala,

Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú.

40Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha,

We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.

41Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu,

Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu.

42Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;

Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya.

43Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama,

Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help