ABÙ ỌMA 7 - Bible Lgbo

Shiggaion nke Devid, nke ọ bùkuru Hehova, bayere okwu Kush, bú onye Benjamin.

1Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo:

Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:

2Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,

Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.

3Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;

Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;

4Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ;

(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)

5Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;

Ka ọ zọda kwa ndum n'ala,

Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah

6Bilie, Jehova, n'iwe-Gi,

Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:

Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.

7Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu:

Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya.

8Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:

Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

9Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:

N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.

10Ọtam dikwasi na Chineke,

Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.

11Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,

Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.

12Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;

Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.

13Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;

Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.

14Le, ime ajọ ihe nēme ya;

Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.

15Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,

O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme.

16Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya,

Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.

17M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di:

M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help