EKLISIASTIS 12 - Bible Lgbo

1Cheta kwa Onye kèworo gi n'ubọchi nile i di n'okorọbia, mb͕e ubọchi ihe ọjọ akābiaghi, na mb͕e arọ akābiarughi nso, mb͕e i gāsi, Ha atọghim utọ;

2mb͕e anyanwu na ìhè na ọnwa na kpakpando nile akāb͕achighi, igwe-oji we lata mb͕e oké miri zosiri:

3n'ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n'ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya,

4mb͕e agēmechi uzọ n'amá; mb͕e olu ogwugwe-nri gāla ala, mb͕e madu gēbili n'urá n'olu nnunu, mb͕e ndinyom nile nke nābù abù gādi ala ala;

5ọzọ, ha gātu egwu ihe di elu, ihe-ujọ di iche iche gādi kwa n'uzọ; osisi almond gāb͕ọwa kwa okoko-ya, ukpala gāghọ kwa ibu, ọchichọ gāgwu kwa: n'ihi na madu nāla n'ulo ebighi-ebi ya, ndi nēti aka n'obi ewe jegharia n'amá buruburu:

6mb͕e akātọpughi udọ̀ ọla-ọcha, mb͕e akētiwaghi kwa ọkwa ọla-edo, mb͕e ite akādawaghi kwa n'isi-iyi, mb͕e akētiwaghi kwa wheel n'olùlù-miri;

7ájá ewe laghachi n'ala dika o si diri, mọ alaghachikuru kwa Chineke Onye nyere ya.

8Ihe-efu kachasi ihe-efu nile, ka Onye-nkpọkọta siri; ha nile bu ihe-efu.

9Ma tukwasi nka, n'ihi na Onye-nkpọkọta mara ihe, ọ nọ nēzí ndi-ya ihe-ọmuma; ọ ṅa-kwa-ra nti, we gwuputa, me ka ọtutu ilu dizie.

10Onye-nkpọkọta chọrọ ichọputa okwu nile nātọ utọ, na ihe edeziri edezi, bú okwu nile nke ezi-okwu.

11Okwu nile nke ndi mara ihe di ka ndudu eji achu ehi, ọzọ, dika ǹtú akumiri nke-ọma ka okwu nke ndi-nwe nzukọ di, bú okwu enyere site n'aka otù onye-ọzùzù-aturu.

12Tukwasi kwa n'ihe ndia, nwam, nara ndum-ọdu: ime ọtutu akwukwọ enweghi ọgwugwu; ọtutu nmuta bu kwa ike-ọgwugwu nke anu-aru.

13Ka ayi nuru nkwubì okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n'iwu; n'ihi na nka bu ọlu madu nile.

14N'ihi na ọlu ọ bula ka Chineke gēme ka ọ ba n'ikpé, ya na ihe ọ bula zoro ezo, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help