1Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya, we me onwe-ya ka ọ di ike imegide Israel.
2O we tiye usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'ala Juda, na n'obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were.
3Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;
4kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.
5Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n'aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n'uba.
6Obi-ya di kwa elu n'uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim.
7Ma n'arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n'obodo Juda nile:
8ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà.
9Ha we zí ihe na Juda, nēji akwukwọ iwu Jehova n'aka-ha; ha we nēje obodo nile nke Juda buruburu, we nēzí ihe n'etiti ndi Juda.
10Oké egwu Jehova we dikwasi ala-eze nile nke ala nile nke di Juda buruburu, ha ebusoghi kwa Jehoshafat agha.
11Ufọdu nime ndi Filistia weta-kwa-ra Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma, na ọla-ọcha òfùfè; ndi Arebia nēweta-kwa-ra ya ìgwè ewu na aturu, nnù ebulu iri-na-iteghete na ọgu ise, na nnù nkpi iri-na-iteghete na ọgu ise.
12Jehoshafat we nāga n'iru we di ike ri nne; o we wue nime Juda ulo uku na obodo nchikọbata-ihe.
13O nwe-kwa-ra ije-ozi bara uba n'obodo Juda nile, na ndikom agha nime Jerusalem, ha bu ndi-dike bu dìnkpà.
14Ma ndia bu ngukọta-ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: nke Juda, ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri; Adna, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnu iri, ndi-dike bu dìnkpà:
15onye so ya bu Jehohanan, bú onye-isi, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-ise:
16onye so ya bu Amasaia nwa Zikri, onye were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ya; ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi-dike bu dìnkpà:
17ndi sitere na Benjamin; otù dike bu dìnkpà, bú Elaiada, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise, ndi nāchi uta na ọta:
18onye so ya bu Jehozabad, ya na orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ abua na nnù iri, ndi ejikere nke usu-ndi-agha.
19Ndia bu ndi nējere eze ozi, nāgughi ndi ahu eze tiyere n'obodo nile ewusiri ike nime Juda nile.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.