II. IHE EMERE 27 - Bible Lgbo

1Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok.

2O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere: nání na ọ baghi n'ulo uku Jehova. Ma ndi Juda nọ nēbibi onwe-ha.

3Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu, o wu-kwa-ra ulo n'uba n'elu mb͕idi Ofel.

4O wu-kwa-ra obodo ufọdu n'ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n'oké ọhia.

5Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n'arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n'arọ nke-abua kwa, na n'arọ nke-atọ.

6Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n'ihi na o doziri uzọ-ya nile n'iru Jehova, bú Chineke-ya.

7Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda.

8Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem.

9Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help