EZIKIEL 15 - Bible Lgbo

1Okwu Jehova we ruem nti, si,

2Nwa nke madu, gini ka osisi vine bu kari osisi ọ bula, bú alaka vine nke diworo n'etiti osisi nile nke oké ọhia?

3Àgēsi nime ya were osisi ime ihe ije ozi? ma-ọbu àgēsi nime ya were nkpukpọ ikokwasi ihe ọ bula n'elu ya?

4Le, n'ọku ka atubàworo ya ibu nri-ya: isi-ya abua ka ọku ripiaworo, etiti-ya anujiwo kwa; ọ̀ gābà n'ije-ozi ọ bula?

5Le, mb͕e o zuru okè, adighi-ewere ya me ihe ije ozi: àgēsi kwa aṅa were ya me ihe ije ozi ọzọ, mb͕e ọku ripiaworo ya, o we nujie?

6N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n'etiti osisi oké ọhia, nke M'nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M'nyeworo ndi bi na Jerusalem.

7M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.

8M'gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help