JOB 28 - Bible Lgbo

1N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di,

Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha.

2Anēsi n'ájá eweputa ígwè,

Anāwu kwa nkume ighọ ọla.

3Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,

Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwa

Nkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.

4O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;

Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;

Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari.

5Ala, nime ya ka nri si aputa:

Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.

6Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,

Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.

7Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,

Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:

8Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,

Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya.

9Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;

Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.

10N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;

Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.

11O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;

Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.

12Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?

Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

13Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;

Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.

14Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:

Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.

15Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya,

Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.

16Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,

Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.

17Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:

Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.

18Agaghi-ehota coral na crystal:

E, nnweta amam-ihe kariri ruby.

19Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,

Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.

20Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?

Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?

21N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,

Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.

22Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,

Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.

23Chineke aghọtawo uzọ-ya,

Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.

24N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,

N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;

25Imere ifufe ihe-ọtùtù;

Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.

26Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo,

Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe:

27Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya;

O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya.

28O we si madu,

Le, egwu Onye-nwe-ayi, nke ahu bu amam-ihe;

Ọzọ, isi n'ihe ọjọ puta bu nghọta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help