JENESIS 5 - Bible Lgbo

1Nka bu akwukwọ osuso-ọmumu nile nke Adam. N'ubọchi Chineke kere madu, n'oyiyi Chineke ka O mere ya;

2nwoke na nwayi ka O kere ha; Ọ gọzie ha, kpọ aha-ha Madu, n'ubọchi ekere ha.

3Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n'oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set:

4ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

5Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.

6Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:

7Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

8ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.

9Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan:

10Enosh di ndu, mb͕e ọ musiri Kenan, nnù arọ abua na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

11ubọchi nile nke Enosh we buru nnù arọ abua na ọgu ise na ise: o we nwua.

12Kenan di ndu ọgu arọ atọ na iri, ọ mua Mahalalel:

13Kenan di ndu, mb͕e ọ musiri Mahalalel, nnù arọ abua na ọgu abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

14ubọchi nile nke Kenan we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri: o we nwua.

15Mahalalel di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Jered:

16Mahalalel di ndu, mb͕e ọ musiri Jered, nnù arọ abua na oru na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

17ubọchi nile nke Mahalalel we buru nnù arọ abua na ọgu anọ na iri na ise: o we nwua.

18Jered di ndu ọgu arọ asatọ na abua, ọ mua Inok:

19Jered di ndu, mb͕e ọ musiri Inok, nnù arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

20ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua.

21Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela:

22Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

23ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise:

24Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.

25Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek:

26Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

27ubọchi nile nke Metusela we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na iteghete: o we nwua.

28Lemek di ndu ọgu arọ iteghete na abua, ọ mua nwa-nwoke:

29ọ kpọ aha-ya Noa, si, Onye a gākasi ayi obi banyere ọlu-ayi, banyekwara ndọb͕u ayi ji aka-ayi adọb͕u onwe-ayi n'ọlu, bú nke putara n'ala Jehova buworo ọnu.

30Lemek di ndu, mb͕e ọ musiri Noa, nnù arọ na ọgu iteghete na iri na ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:

31ubọchi nile nke Lemek we buru nnù arọ na ọgu iri-na-asatọ na arọ iri na asa: o we nwua.

32Noa we b͕a nnù arọ na ọgu ise: Noa we mua Shem, na Ham, na Jefet.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help