I. IHE EMERE 2 - Bible Lgbo

1Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;

2Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha.

3Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua.

4Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise.

5Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul.

6Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise.

7Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ewezugara nye Jehova.

8Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia.

9Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai.

10Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda:

11Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz;

12Boaz mua Obed, Obed mua Jesi;

13Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ;

14na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise;

15na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:

16Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.

17Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.

18Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.

19Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.

20Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.

21Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead.

23Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead.

24Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa.

25Umu-ndikom Jerahmeel ọkpara Hezron bu kwa: Ram, bú ọkpara, na Buna, na Oren, na Ozem, na Ahaija.

26Ma Jerahmeel nwere nwunye ọzọ, aha-ya bu Atara; nwayi ahu bu nne Onam.

27Umu-ndikom Ram, bú ọkpara Jerahmeel, bu Maaz, na Jamin, na Eka.

28Umu-ndikom Onam bu Shamai, na Jada: umu-ndikom Shamai kwa; Nedab, na Abishua.

29Aha nwunye Abishua bu Abihail; o we muara ya Ahban, na Molid.

30Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom.

31Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai.

32Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom.

33Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel.

34Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha.

35Sheshan we were nwa-ya nwayi nye Jaha, bú orù-ya, na nwunye; o we muara ya Atai.

36Atai mua Netan, Netan mua Zabad;

37Zabad mua Eflal, Eflal mua Obed;

38Obed mua Jihu, Jihu mua Azaraia;

39Azaraia mua Helez, Helez mua Eleasa;

40Eleasa mua Sismai, Sismai mua Shalum;

41Shalum mua Jekamaia, Jekamaia mua Elishama.

42Umu-ndikom Keleb kwa, bú nwa-nne Jerahmeel; Misha, bú ọkpara-ya, onye ahu bu nna Zif; na umu-ndikom Marisha, bú nna Hebron.

43Umu-ndikom Hebron kwa; Kora, na Tapua, na Rekem, na Shema.

44Shema we mua Raham, bú nna Jọkeam; Rekem mu-kwa-ra Shamai.

45Nwa-nwoke Shamai bu Maon; Maon bu nna Bet-zua.

46Ifa, bú iko-nwayi Keleb, muru Haran, na Moza, na Gazez: Haran we mua Gazez.

47Umu-ndikom Jahdai kwa; Regem, na Jotam, na Gishan, na Pelet, na Ifa, na Shaaf.

48Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana.

49Ọ mu-kwa-ra Shaaf nna Madmana, na Sheva nna Makbina, na nna Gibea; nwa-nwayi Keleb bu Aksa.

50Ndia bu umu-ndikom Keleb; nwa-nwoke Hua, ọkpara Efrata, Shobal nna Kiriat-jearim;

51Salma nna Bet-lehem, Harif nna Bet-gadea.

52Shobal nna Kiriat-jearim nwe-kwa-ra umu-ndikom; Haroe, nkera Menuhot.

53Ab͕uru nile nke Kiriat-jearim kwa; ndi-Jeta, na ndi-Putait, na ndi-Shumatait, na ndi-Mishraait; nime ndia ka ndi Zọra na ndi Eshtaol si puta.

54Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra.

55Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help