JOB 26 - Bible Lgbo

1Job we za, si,

2Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike?

Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?

3Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe?

Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?

4Ònye ka i gosiworo okwu?

Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?

5Ndi nādighi ndu nāma jijiji

N'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.

6Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya,

Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.

7Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu,

O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.

8Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya;

Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.

9Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike,

Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.

10Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri,

Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.

11Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji,

Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.

12Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du,

Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.

13Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma;

Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.

14Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile:

Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya!

Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help