ABÙ ỌMA 147 - Bible Lgbo

1Tonu Ja;

N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma;

N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma.

2Jehova nēwuli Jerausalem elu;

Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta.

3Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu,

Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.

4Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando;

Ha nile ka Ọ nākpọ aha.

5Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne;

Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu.

6Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ:

Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.

7Werenu ekele za Jehova,

Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:

8Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,

Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,

Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.

9Ọ nēnye anumanu nri-ya,

Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.

10Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:

Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.

11Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,

Ndi nēchere ebere-Ya.

12Gi Jerusalem, nāja Jehova;

To Chineke-gi, Zaion.

13N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;

Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.

14Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;

Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;

Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;

Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:

Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?

18Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:

Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

19Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,

Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.

20O mesoghi mba ọ bula otú a:

Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha.

Tonu Ja.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help