I. SAMUEL 21 - Bible Lgbo

1Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ?

2Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n'iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m'nyeworo gi n'iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n'ebe di otú a otú a.

3Ma ub͕u a gini di n'okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n'aka, ma-ọbu ihe agāchọta.

4Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n'okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru.

5Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N'ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n'imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m'nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta?

6Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya.

7Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.

8Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n'ebe a n'okpuru aka-gi? n'ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n'ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.

9Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n'ákwà n'azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n'ihi na ọ dighi ọzọ di n'ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.

10Devid we bilie, b͕apu n'ubọchi ahu n'iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.

11Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n'ite-egwú, si,

Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,

Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?

12Devid we tiye okwu ndia n'obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku.

13O we b͕anwe omume-ya n'anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n'aka-ha, ọ ka kwa akàrà n'ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n'afu-ọnu-ya.

14Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n'ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem?

15Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n'irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n'ulom?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help