ỌPUPU 33 - Bible Lgbo

1Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, si n'ebe a rigo, gi onwe-gi na ndi ahu nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ya:

2M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:

3rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya: n'ihi na M'gaghi-arigo n'etiti gi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu: ka M'we ghara ime ka i gwusia n'uzọ.

4Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n'aru ya.

5Jehova we si Moses, Si umu Israel, Unu onwe-unu bu ndi kwesiri olu ike: asi na ọ bu otù ntabi-anya ka M'gārigo n'etiti gi, M'gēme kwa ka i gwusia; ma ub͕u a wepu ihe-ichọ-nma-gi nile n'aru gi tọb͕ọ, M'we mara ihe M'gēme gi.

6Umu Israel we napusi onwe-ha ihe-ichọ-nma-ha nile site n'ugwu Horeb gaba.

7Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, n'ebe di anya site n'ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

8O rue, mb͕e Moses puru ije Ulo-ikwū ahu, na ndi Israel nile biliri, guzo onwe-ha ọtọ, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya, nēlegide Moses anya n'azu, rue mb͕e ọ bara n'Ulo-ikwū ahu.

9O rue, mb͕e Moses batara n'Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu.

10Ndi Israel nile we hu ogidi igwe-oji ka o nēguzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū ahu: ndi ahu nile we bilie, kpọ isi ala, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya.

11Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua.

12Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.

13Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, biko, mem ka m'mara uzọ-Gi nile, m'gāmara kwa Gi, ka m'we huta amara n'iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu.

14Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike.

15Ọ si Ya, Ọ buru na iru-Gi adighi-eje, emela ka ayi si n'ebe a rigo.

16N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n'iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n'ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n'ebe ndi nile nọ ndi bi n'elu uwa.

17Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.

18Ọ si, Biko, me ka m'hu ebube-Gi.

19Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya.

20Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n'ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu.

21Jehova we si, Le, ọnọdu di n'akukum, i gēguzo kwa onwe-gi ọtọ n'elu oké nkume ahu.

22O gēru kwa, mb͕e ebubem nāgabiga, na M'gētiye gi nime oghere nke oké nkume ahu, b͕asa ọbu-akam b͕ochita gi, rue mb͕e M'gabiga-woro:

23M'gēwezuga kwa ọbu-akam, i gāhu kwa azum anya: ma agaghi-ahu irum anya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help