I. SAMUEL 3 - Bible Lgbo

1Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.

2O rue, n'ubọchi ahu, mb͕e Ilai nēdina ala n'ebe-ya, (ma anya-ya malitere ihu inyoghi-inyoghi, na ọ pughi ihu uzọ,)

3mb͕e oriọna Chineke akānyughi anyu, mb͕e Samuel nēdina ala n'ulo ukwu Jehova, ebe ib͕e Chineke di;

4na Jehova kpọrọ Samuel òkù: o we si, Lem.

5O we b͕akuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù; jeghachi dina ala. O we je dina ala.

6Jehova we kpọ kwa òkù ọzọ, si, Samuel. Samuel we bilie jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù, nwam; jeghachi dina ala.

7Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya.

8Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù.

9Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n'ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n'ebe-ya.

10Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu.

11Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.

12N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.

13Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.

14N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.

15Samuel we dina ala rue ututu, we meghepu ọnu-uzọ ulo Jehova. Ma Samuel turu egwu igosi Ilai ọhù ahu.

16Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem.

17Ọ si, Gini bu okwu ahu nke Ọ gwara gi? biko, ezonarilam ya: Chineke me gi otú a, me kwa gi ihe ọzọ otú a, ọ buru na i zonarim okwu ọ bula sitere n'okwu nile nke Ọ gwara gi.

18Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.

19Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile.

20Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma.

21Jehova we me ka ahú kwa ya anya ọzọ nime Shailo: n'ihi na Jehova kpughere Onwe-ya nye Samuel nime Shailo n'okwu Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help