ILU 10 - Bible Lgbo

1Ilu di iche iche nke Solomon.

Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria:

Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya.

2Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù:

Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.

3Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume:

Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu.

4Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu:

Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.

5Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche:

Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere.

6Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume:

Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

7Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi:

Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.

8Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu:

Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

9Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi:

Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya.

10Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta:

Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu.

11Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu:

Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu.

12Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche:

Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi.

13N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe:

Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ.

14Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma:

Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso.

15Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike:

Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu.

16Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu;

Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie.

17Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu:

Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue.

18Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha;

Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu.

19N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi:

Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche.

20Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu:

Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà.

21Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu:

Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha.

22Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya,

Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta.

23Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ:

Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta.

24Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya:

Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha.

25Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa:

Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi.

26Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di,

Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ.

27Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu:

Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu.

28Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù:

Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.

29Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu;

Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ.

30Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi:

Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa.

31Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru:

Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya.

32Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ:

Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help