ABÙ ỌMA 140 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ;

Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche:

2Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha;

Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche.

3Ha amuwo ire-ha dika agwọ;

Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha. Selah

4Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu;

Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike:

Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile.

5Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche;

Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ;

Ọnyà di iche iche ka ha siworom. Selah

6Asirim Jehova, Chinekem ka I bu:

Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.

7Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam,

I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile.

8Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike;

Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu. Selah

9Ma isi ndi nọm buruburu,

Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha.

10Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha:

Ya me ka ha dabà n'ọku;

N'ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ.

11Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa:

Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.

12Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala,

Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.

13N'ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi:

Ndi ziri ezi gēbi n'iru Gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help