ABÙ ỌMA 150 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya:

Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya.

2Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile:

Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di.

3Werenu ọfufù opì-ike to Ya:

Chirinu une na ubọ-akwara to Ya.

4Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya:

Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:

5Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya:

Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya.

6Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja.

Tonu Ja.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help