ABÙ ỌMA 71 - Bible Lgbo

1Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo:

Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.

2N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu:

Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam.

3Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nile

I nyewo iwu izọputam;

N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu,

N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova:

Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem:

Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem:

Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

7Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube;

Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.

8Ọnum gējuputa n'otuto-Gi,

Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.

9Etufulam na mb͕e agadi;

Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

10N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem;

Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11Si, Chineke arapuwo ya:

Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12Chineke, anọlam ebe di anya:

Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

13Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim;

Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

14Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi,

We tukwasi otuto n'otuto-gi nile

15Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi,

Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi;

N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.

16M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia:

M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.

17Chineke, I zíwom ihe site na nwata;

Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile.

18Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke;

Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi

Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.

19Ọzọ, ezi omume-Gi, Chineke, nādiru ebe di elu;

Gi Onye meworo ihe uku di iche iche, Chineke, ònye di ka Gi?

20Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ,

I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ,

Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.

21Me ka idi-ukum bakari uba,

Gi chighari kwa kasiem obi.

22Mu onwem gēji kwa une kele Gi,

Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem:

M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma,

Gi Onye Nsọ nke Israel.

23Eb͕ub͕ere-ọnum abua gēti nkpu ọṅù mb͕e m'nābùku Gi abù ọma;

Nkpuru-obim, nke I b͕aputaworo, gēti kwa nkpu ọṅù.

24Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile:

N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help