AISAIA 39 - Bible Lgbo

1Na mb͕e ahu Merodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: ọ nu-kwa-ra na Hezekaia riarari ọria, we nwe aru-ike.

2Hezekaia we ṅuria ọṅu bayere ha, me ka ha hu ulo nke ihe-ya di oké ọnu-ahia, bú ọla-ọcha-ya, na ọla-edo-ya, na uda-ya di iche iche, na ezi manu-ya, na ulo nile nke ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke achọtara n'àkù-ya nile: ọ dighi ihe di n'ulo-ya, ma-ọbu n'ala nile ọ nāchi, nke Hezekaia nēmeghi ka ha hu.

3Aisaia, bú onye-amuma, we biakute eze, bú Hezekaia, si ya, Gini ka ndikom ndia siri gi? òle ebe ka ha si kwa biakute gi? Hezekaia we si, Ọ bu n'ala di anya ka ha si biakutem, ọbuná na Babilon.

4Ọ si, Gini ka ha huru n'ulo-gi? Hezekaia we si, Ihe nile nke di n'ulom ka ha huru: ọ dighi ihe di n'àkùm nile nke m'nemeghi ka ha hu.

5Aisaia we si Hezekaia, Nuru okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha.

6Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.

7Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulọ uku eze Babilon.

8Hezekaia we si Aisaia, Ọ di nma, bú okwu Jehova nke i kwuworo. Ọ si kwa, N'ihi na udo na ezi-okwu gādi n'ubọchim nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help