NDI EFESỌS 1 - Bible Lgbo

1Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, nēdegara ndi nsọ ndi nọ n'Efesọs, na ndi kwere na Kraist Jisus, akwukwọ:

2Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bu Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

3Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:

4dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa, ka ayi we di nsọ buru kwa ndi anāpughi ita uta n'iru Ya n'ihu-n'anya:

5ebe O buru uzọ ka ayi àkà ka ewe site n'aka Jisus Kraist do ayi ka umu-Ya ndikom, dika ọ di Ya ezi nma n'ọchichọ-Ya,

6ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya:

7Onye ayi sitere n'ọbara-Ya nwe nb͕aputa-ayi nime Ya, bú nb͕aghara nke ndahie nile ayi, dika àkù nke amara-Ya si di,

8nke O mere ka ọ babigara ayi ókè n'amam-ihe na uche nile,

9mb͕e O mesiri ka ayi mara ihe-omimi nke ihe Ọ chọrọ, dika ọ di Ya ezi nma, bú ihe O zubere nime Ya,

10rue ọchichi-èzi-na-ulo nke ozuzù oge akara àkà, ichikọta ihe nile nime Kraist-ayi dika Isi, bú ihe nile di n'elu-igwe, na ihe nile di n'elu uwa; nime Ya, ka m'kwuru,

11Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;

12ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:

13Onye unu onwe-unu nọ kwa nime Ya, mb͕e unu nuru okwu nke ezi-okwu ahu, bú ozi ọma nke nzọputa-unu, ọ bu kwa nime Ya, mb͕e unu kwekwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà,

14bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa-ayi, rue nb͕aputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya.

15N'ihi nka mu onwem kwa, ebe m'nuru okwu bayere okwukwe di nime unu nke unu kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya unu ji hu ndi nsọ nile,

16ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem;

17ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya;

18ebe emeworo ka anya obi-unu nara ìhè, ka unu we mata ihe bu olile-anya nke ọkpukpọ-Ya, mata kwa ihe bu àkù nke ebube nke ihe-nketa-Ya n'etiti ndi nsọ Ya,

19mata kwa otú ike-Ya di uku ri nne n'ebe ayi nọ, bú ndi kwere, dika ilusi-ọ1u-ike nke idi-ike nke ike-Ya si di,

20nke Ọ lusiri ike nime Kraist, mb͕e O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, me kwa ka Ọ nọdu n'aka-nri-Ya n'ebe di n'elu-igwe,

21kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bughi nání n'oge a, kama ọ bu kwa n'oge nke gaje ibia:

22O do-kwa-ra ihe nile n'okpuru ukwu-Ya abua, ọ bu kwa Ya onwe-ya ka O mere ka Ọ buru isi n'elu ihe nile n'ebe nzukọ-Ya nọ,

23nke bu aru-Ya, ozuzù nke Onye ahu Nke nāluzu ihe nile nime madu nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help