1Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya?
N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?
2Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku;
Anējide ha na nzube nile nke ha chère.
3N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike,
Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.
4Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju.
Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.
5Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;
Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:
Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.
6o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum:
Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.
7Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:
N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.
8Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:
N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:
Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.
9Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya:
Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala:
Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.
10Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,
Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.
11Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo:
O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.
12Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu:
Echezọla ndi ewedara n'ala.
13N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke?
Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju.
14I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi:
N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya;
Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.
15Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu;
Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.
16Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi:
Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì.
17I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova:
I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:
18Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe,
Ka madu nke sitere n'uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.