HOSEA 10 - Bible Lgbo

1Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.

2O kesawo obi-ha; ub͕u a ka ikpe gāma ha: Ya onwe-ya gētipia ebe-ichu-àjà nile ha, bibie ogidi nile ha.

3N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?

4Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.

5Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.

6Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.

7Emewo ka Sameria la n'iyì, ya na eze-ya, dika irighiri-osisi n'elu miri.

8Agēkpochapu kwa ebe nile di elu nke Even, bú nmehie Israel: ogwu na uke gēpulite n'ebe-ichu-àjà nile ha; ha gāsi kwa ugwu nile, Kpuchienu ayi; ha gāsi kwa ugwu ntà nile, Dakwasinu ayi.

9Site n'ubọchi Gibea ka i mehieworo, gi Israel: n'ebe ahu ka ha guzoro; ka agha anēbuso umu ajọ omume we ghara irute ha nime Gibea.

10Mb͕e M'chọrọ, M'gādọ ha aka na nti; agāchikọta kwa ndi nile di iche iche imegide ha, mb͕e agēke ha ab͕u n'ajọ omume-ha abua.

11Efraim bu kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke emeworo ka ọ muta ihe, nke nāhu izọcha ọka n'anya; ma Mu onwem agabigawo n'elu olu-ya di nma: M'gēme ka anọkwasi Efraim dika inyinya; Juda gādọ ihe eji gwu ala-ubi, Jekob gētipiara ya ájá.

12Gharanu onwe-unu nkpuru n'ezi omume, wenu ihe-ubi dika ebere si di; lucharanu onwe-unu ubi: n'ihi na ọ bu mb͕e ichọ Jehova, rue mb͕e Ọ gābia, zokwasi unu ezi omume dika miri.

13Unu aluwo nmebi-iwu dika ubi, ajọ omume ka unu weworo dika ihe-ubi; unu eriwo nkpuru okwu-ugha: n'ihi na i tukwasiri uzọ-gi obi, n'iba-uba nke ndi-dike-gi.

14Nkpọtu gēbili kwa n'etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n'ubọchi agha: nne n'elu umu-ya ka atupiara.

15Otú a ka Bet-el gēme unu n'ihi ihe ọjọ unu nke kachasi ihe ọjọ nile: na chi-ọbubọ ka agēme ka eze Israel lasia n'iyì.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help