ABÙ ỌMA 64 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1Chineke, nuru olum n'itughari-uchem:

Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro.

2I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ:

N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe:

3Ndi muworo ire-ha dika mma-agha,

Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:

4Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche:

Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.

5Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike;

Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo;

Ha siri, Ònye gāhu ha?

6Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma:

Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.

7Ma Chineke nāb͕a ha àkú;

Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.

8Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha:

Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.

9Madu nile gātu kwa egwu;

We gosi ọlu Chineke,

Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.

10Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya;

Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help