I. NDI KỌRINT 8 - Bible Lgbo

1Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo.

2Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima;

3ma ọ buru na onye ọ bula nāhu Chineke n'anya, onye ahu ka Chineke mara.

4Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.

5N'ihi na asi na ọ bu kwa ezie na ndi anākpọ chi di, ma ọ bu n'elu-igwe ma-ọbu n'elu uwa; dika ọtutu chi na ọtutu ndi-nwe-madu di;

6ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.

7Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike.

8Ma ihe-oriri agaghi-eche ayi n'iru Chineke: ma asi na ayi erighi, ọ dighi ihe fọduru ayi inwe; ma asi kwa na ayi nēri, ayi ababigaghi ókè.

9Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ.

10N'ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n'àjà nye arusi?

11N'ihi na site n'ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n'iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n'ihi ya.

12Ma otú a, mb͕e unu nēmehie megide umu-nna-unu, nētib͕u kwa akọ-na-uche-ha mb͕e ọ nādighi ike, unu nēmehie megide Kraist.

13N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help