ABÙ ỌMA 57 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù: Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ọ b͕apuru n'iru Sọl ba n'ọb͕à.

1Merem amara, Chineke, merem amara;

N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo:

Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà,

Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga.

2M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu;

M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe.

3O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam,

Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Selah

Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.

4Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum;

M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku,

Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú,

Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.

5Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke;

Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile.

6Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile;

Nkpuru-obim erudawo n'ala:

Ha egwuwo olùlù n'irum;

Ha adabàwo n'etiti ya. Selah

7Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim:

M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma.

8Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara:

M'gākpọte chi-ọbubọ.

9M'gēkeli gi n'etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi:

M'gābùku Gi abù ọma n'etiti mba nile.

10N'ihi na ebere-Gi di uku rue elu-igwe,

Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.

11Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke;

Ka ebube-Gi di n'elu uwa nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help